Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 12 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Jenụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 1 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 1 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 2:5–12

5Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa. 6Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? 7Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze, 8dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya. 9Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile. 10Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ. 11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 8:1, 4–8

1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha? 5I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 8na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

Oziọma

Mak 1:21–28

21Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe. 22Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu. 23Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, 24sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” 25Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!” 26Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta. 27Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.” 28Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike