Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 11 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Jenụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 1 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 1 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 1:1–6

1Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. 2Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. 3Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. 4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha. 5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 97:1–2, 6–7, 9

1Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 7A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee feenụ ya ofufe, unu chi niile! 9Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.

Oziọma

Mak 1:14–20

14Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke. 15Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.” 16Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ. 17Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 18Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya. 19Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha. 20Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike