Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 12 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 30 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Jenụwarị 2027
Tiuzdee · Izu nke 33 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Nativity of Our Lord
Oge Krismas (Svyatki)
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
16Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume: 17ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla. 4:1Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị, 2kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ. 3Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ. 4Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi.
Oziọma
11Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani. 12Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya. 13Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. 14Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a. 15Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru. 16O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. 17Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. ” 18Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya. 19Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ. 20Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ. 21Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!” 22Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. 23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Disemba na kalenda nzukọ bụ 12 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike