Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 11 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 29 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Jenụwarị 2027

Mọnde · Izu nke 33 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Nativity of Our Lord

Oge Krismas (Svyatki)

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Tm 2:20–26

20Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla. 21Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ. 22Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta. 23Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu. 24O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya. 25Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu. 26Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.

Oziọma

Mak 10:46–52

46Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. 47Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!” 48Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 49Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.” 50Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs. 51Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.” 52Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Disemba na kalenda nzukọ bụ 11 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike