Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 31 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Disemba 2026

Tọọzdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

31 Disemba — ụbọchị nke asaa nʼime ụbọchị asatọ nke Krismas

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Silvesta nke Mbụ, Pope · Ncheta nkenke

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Jọn 2:18–21

18Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ. 19Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị. 20Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile. 21Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 96:1–2, 11–13

1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile. 2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. 11Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ. 13Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.

Oziọma

Jọn 1:1–18

1Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. 2Ya na Chineke nọ site na mbụ. 3E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya. 4Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile, 5ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya. 6Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. 7Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere. 8Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ. 9Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa. 10Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ. 11Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya. 12Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. 13Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke. 14Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu. 15Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ” 16Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara. 17Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst. 18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike