Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 31 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 18 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Disemba 2026
Tọọzdee · Izu nke 31 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Sebastian at Rome with his companions: Martyrs Nicostratus, his wife Zoe, Castorius, Tranquillinus the Presbyter and his sons the Deacons Marcellinus and Mark, Claudius, his son Symphorian and brother Victorinus, Tiburtius and Castulus († c. 287)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. 20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. 21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. 22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. 23Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. 24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. 25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme. 26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. 27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
Oziọma
10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara. 11Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” 12Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ? 13Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.” 14Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka. 15Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya. 16Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Disemba na kalenda nzukọ bụ 31 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike