Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 25 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 12 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Disemba 2026

Fraịdee · Izu nke 30 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Saint Spyridon the Wonderworker, Bishop of Tremithus († c. 348)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 11:8, 11–16

8Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga. 11Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi. 12Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri. 13Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa. 14Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha. 15Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ. 16Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.

Oziọma

Luk 21:37–22:8

37Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị. 38Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya. 22:1Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso. 2Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ. 3Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya. 4Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha. 5Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego. 6O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ. 7O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja. 8O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Disemba na kalenda nzukọ bụ 25 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike