Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 24 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Disemba 2026
Tọọzdee · Izu nke 4 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
24 Disemba
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike, 2ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.” 3Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere gị.” 4Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị, 5“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi? 8“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel. 9Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. 10Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, 11dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “ ‘ Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ. 12Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. 16Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. 2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela 26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 28Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
Oziọma
67E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị, 68“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya. 69O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid. 70(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). 71Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị. 72O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ. 73Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa: 74Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu. 75Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị. 76“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ. 77Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha. 78Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe. 79Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike