Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 9 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Disemba 2026

Wenezdee · Izu nke 2 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 2 nke Advent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Onye nsọ Juan Diego · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 40:25–31

25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” 28Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. 29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. 30Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, 31ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 103:1–4, 8, 10

1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.

Oziọma

Mat 11:28–30

28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike