Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 10 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Disemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 2 nke Advent

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 2 nke Advent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Nne anyị nke Loreto · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 41:13–20

13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’ 14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel. 15“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka. 16Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel. 17“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ. 18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta. 19Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu, 20ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 145:1, 9–13

1Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 9Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị. 10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, 12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. 13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.

Oziọma

Mat 11:11–15

11Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya. 12Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya. 13Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a. 14Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa. 15Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike