Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 8 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Disemba 2026
Tiuzdee · Izu nke 2 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Ịtụrụ ime na-enweghị ntụpọ nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
9Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” 10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” 11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” 20Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
Ihe ọgụgụ nke abụọ
3Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. 4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. 5O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. 6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya. 11Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya. 12Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya.
Oziọma
26Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.” 29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” 34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” 35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” 38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike