Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 16 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 3 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Novemba 2026

Mọnde · Izu nke 25 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Akepsimos the Bishop, Joseph the Presbyter and Haiphal the Deacon of Persia (4th C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Te 1:1–10

1Pọl, na Saịlas, na Timoti dere akwụkwọ a, Na-edegara nzukọ dị nʼobodo Tesalonaịka nʼime Chineke Nna anyị, na nʼime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa. 4Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu. 5Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya. 6Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu. 7Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè. 8Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya, 10nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.

Oziọma

Luk 11:29–33

29Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona. 30Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a. 31Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a. 32Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.” 33“Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna dọnye ya nʼebe zoro ezo maọbụ nʼokpuru efere, kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Novemba na kalenda nzukọ bụ 16 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike