Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 14 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 1 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Novemba 2026

Satọdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Holy Wonderworkers and Unmercenaries Cosmas and Damian of Mesopotamia, and their mother, Saint Theodotia (3rd C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 11:1–6

1Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m. 2Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke. 3Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi. 4Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara. 5Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma. 6Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Kọsmas na Onye nsọ Damian)

1Kọ 12:27–13:8

27Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ. 28Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche. 29Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube? 30Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche? 31Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma. 13:1A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda. 2A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla. 3A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya. 4Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. 5Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. 6Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. 7Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara. 8Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.

Oziọma

Luk 8:16–21

16“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. 17Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè. 18Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.” 19Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ. 20Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.” 21Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”

Oziọma (maka Onye nsọ Kọsmas na Onye nsọ Damian)

Mat 10:1, 5–8

1Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 5Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ. 6Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Novemba na kalenda nzukọ bụ 14 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike