Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 13 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 31 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Novemba 2026

Fraịdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Apostles of the 70: Stachias, Amplias, Urban, Narcissos, Apellias and Aristoboulos (1st C)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 5:9–13, 24–28

9Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ. 11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme. 12Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ. 13Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo. 24Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 25Biko ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere. 26Werenụ isurita ọnụ dị nsọ na-ekele ụmụnna anyị dum. 27Iwu m na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị bụ ka unu gụpụta akwụkwọ a nʼihu ụmụnna niile. 28Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.

Oziọma

Luk 11:23–26

23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa. 24“Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’ 25Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma. 26Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 13 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike