Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 6 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Novemba 2026

Fraịdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Fil 3:17–4:1

17Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu. 18Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie. 19Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa. 20Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa. 21Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya. 4:1Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 122:1–2, 4–5

1Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. 4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. 5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

Oziọma

Luk 16:1–8

1Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi. 2Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’ 3“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ. 4Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’ 5“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’ 6“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’ 7“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’ 8“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike