Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 4 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Novemba 2026

Wenezdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Chalz Borromeo, Bishọp · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Fil 2:12–18

12Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji. 13Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ. 14Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu. 15Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa! 16Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu. 17Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ 18otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 27:1, 4, 13–14

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 14:25–33

25Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha: 26“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 27Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m. 28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya? 29Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị, 30na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’ 31“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ? 32Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya. 33Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike