Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 5 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Novemba 2026

Tọọzdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Fil 3:3–8

3Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ. 4Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: 5e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii; 6igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke. 7Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. 8E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:2–7

2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.

Oziọma

Luk 15:1–10

1Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu. 2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.” 3Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, 4“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya? 5Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya. 6Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’ 7Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa. 8“Maọbụ olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ nʼotu nʼime ha adafuo. Ọ gaghị amụnye oriọna, zaa ime ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutu ọ chọta ya? 9Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’ 10Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike