Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 3 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 21 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Novemba 2026

Tiuzdee · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Hilarion the Great († 371-372)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 1:6–10

6Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu. 7Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa. 8Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya. 9Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke, 10na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.

Akwụkwọ ozi (maka Wenezdee)

1Te 2:1–8

1Unu onwe unu maara, ụmụnna, na ọbịbịa anyị bịakwutere unu abụghị ihe lara nʼiyi. 2Anyị tara ahụhụ na mbụ e mekwara anyị ihe ihere na Filipai dịka unu maara, ma site nʼinyeaka Chineke anyị nwere obi ike ịgwa unu oziọma ya, ọ bụladị mgbe a na-eguzogide anyị nʼebe ọ dị ukwuu. 3Nʼihi na arịrịọ anyị na-arịọ unu esiteghị na njehie pụta maọbụ nʼọchịchọ nke na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ nʼaghụghọ. 4Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị. 5Ọ dịghị mgbe ọbụla, dị ka unu maara, anyị kwuru okwu nrafu maọbụ were ụzọ aghụghọ zoo anya ukwu anyị nwere. Chineke bụ onye akaebe anyị. 6Ọ dịghị mgbe anyị chọrọ ka ndị mmadụ ọbụla maọbụ unu, maọbụ ndị ọzọ, too anyị. 7Ọ bụ ezie, dị ka ndị ozi Kraịst, anyị gara abụ ibu arụ nye unu. Kama, anyị biri nʼetiti unu site nʼịdị nwayọọ dị ka ndị bụ nne na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha. 8Nʼihi na anyị hụrụ unu nʼanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị naanị na anyị kwusaara unu oziọma Chineke kama anyị nyekwara unu ndụ anyị. Nʼihi na unu dị anyị nʼobi nke ukwu.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Hilarion Onye Ukwu)

2Kọ 9:6–11

6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. 7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. 8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. 9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” 10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba. 11Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.

Oziọma

Luk 9:23–27

23Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m. 24Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya. 25Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya? 26Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ. 27“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”

Oziọma (maka Wenezdee)

Luk 9:44–50

44“Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.” 45Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara. 46Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu. 47Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya. 48Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.” 49Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.” 50Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 3 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike