Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 29 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 16 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Ọktoba 2026
Tọọzdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Longinus the Centurion, who stood at the Cross of the Lord and with him 2 other Martyrs (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
2Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele. 3Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ, 4ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri. 5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. 6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma. 7Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m. 8Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume. 9Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a.
Oziọma
7Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie. 8Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ. 9Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya. 10Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha. 11Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.
Oziọma (maka Onye nsọ Longinọs onyeisi agha)
33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. 38Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 39Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, 40na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!” 41Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị, 42“Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ” 44Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 47Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.” 48Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.” 50Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume. 51Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. 54Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 29 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike