Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 29 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Ọktoba 2026

Tọọzdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 6:10–20

10Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu. 11Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. 12Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. 13Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. 14Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. 15Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu. 16Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ. 17Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu. 18Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile. 19Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla, 20nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 144:1–2, 9–10

1Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. 2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. 9O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu; 10gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ

Oziọma

Luk 13:31–35

31Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.” 32Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m. 33Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem. 34“O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị. 35Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’ ”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike