Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 28 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 15 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Ọktoba 2026

Wenezdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Euthymios the New, of Thessalonica and Monk of Mt Athos († 889)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 3:17–4:1

17Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya. 18Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị. 19Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume. 20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị. 21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi. 22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi. 23Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. 24Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi. 25Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya. 4:1Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe.

Oziọma

Luk 8:22–25

22Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ, 23ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu. 24Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. 25Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 28 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike