Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 28 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Ọktoba 2026
Wenezdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Ndị nsọ Saimọn na Jud, Ndị ozi
Mmemme · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. 2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
Oziọma
12Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke. 13Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. 14Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi. 15Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt. 16Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye. 17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Saimọn na Jud, Ndị ozi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike