Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 30 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Ọktoba 2026
Fraịdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai. 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu. 4Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. 5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a. 6Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs. 7Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ. 8Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. 9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. 10Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. 11Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 6O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
Oziọma
1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 2Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. 3Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?” 4Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa. 5Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?” 6Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike