Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 27 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Ọktoba 2026
Tiuzdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
21Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst. 22Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. 23Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. 24Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile. 25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. 26O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. 27Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. 28Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. 29Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị. 30Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya. 31“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 32Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya. 33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. 4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
Oziọma
18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike