Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 27 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 14 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Ọktoba 2026
Tiuzdee · Izu nke 22 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Martyrs Nazarius, Gervasius, Protasius and Celsius of Milan (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche? 21“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”? 22Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ. 23Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ. 3:1Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. 2Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa. 3Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.
Oziọma
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya, 2na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa, 3na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 27 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike