Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 22 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Ọktoba 2026
Tọọzdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Jọn Pọl nke Abụọ, Pope · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị, 15onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha. 16Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; 17ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya. 18Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, 19na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke. 20Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị, 21ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.
Abụ Ọma nzaghachi
1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. 2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile. 12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
Oziọma
49“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu! 50Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya 51Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa. 52Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ. 53Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn Pọl nke Abụọ, Pope
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike