Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 23 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Ọktoba 2026
Fraịdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Jọn nke Capistrano, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 2Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike. 3Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya? 4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. 5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. 6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela
Oziọma
54Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa. 55Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ. 56Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a? 57“Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi? 58Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 59Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn nke Capistrano, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike