Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 21 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Ọktoba 2026

Wenezdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 3:2–12

2Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu. 3Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu. 4Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere, unu ga-aghọta ihe m maara banyere ihe omimi Kraịst. 5Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a. 6Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma. 7E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke Chineke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya. 8Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst, 9meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. 10Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe Chineke nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata. 11Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, 12bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Aịz 12:2–6

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Oziọma

Luk 12:39–48

39Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya. 40Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.” 41Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?” 42Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri? 43Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi. 44Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere. 45Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke. 46Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe. 47“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. 48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike