Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 22 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 9 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Ọktoba 2026

Tọọzdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Holy Apostle James the son of Alphæus (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 1:24–29

24Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. 25Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya. 26Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. 27Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ. 28Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst. 29Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.

Oziọma

Luk 7:17–30

17Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu. 18Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 19zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?” 20Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ” 21Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. 22Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma. 23Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 24Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 25Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. 26Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. 27Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 28Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.” 29(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 22 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike