Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 20 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 7 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Ọktoba 2026

Tiuzdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Sergius and Baccus in Syria († 290-303)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 1:1–2, 7–11

1Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti, 2Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu. 7Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu. 8O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ. 9Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile. 10Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile. 11Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,

Oziọma

Luk 6:37–45

37“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu. 38Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.” 39Ọ tụkwaara ha ilu a, “Onye ìsì ọ pụrụ idu onye ìsì ibe ya? Ha abụọ ọ gaghị adaba nʼime olulu? 40Onye na-eso ụzọ onye ozizi anaghị akarị onye nkuzi ya, kama mgbe ọ mụtasịrị ọ ga-amata ihe dị ka onye nkuzi ya. 41“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 42Ị ga-esi aṅaa sị nwanna gị, ‘Nwanna a, ka m wepụ gị ntakịrị ahịhịa dị gị nʼanya,’ mgbe gị onwe gị na-ahụghị obodobo osisi dị gị nʼanya? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ nke ọma wepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya. 43“Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma. 44Ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta fiig site nʼosisi ogwu, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta mkpụrụ grepu nʼobi ogwu. 45Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 20 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike