Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 1 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Ọktoba 2026

Tọọzdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Teresa nke Nwa Jisọs, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Job 19:21–27

21“Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere, nʼihi na aka Chineke na-emegide m. 22Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m? Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ? 23“Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ, 24na e ji mkpisi igwe dee ha, maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi. 25Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ. 26Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke. 27Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 27:7–9, 13–14

7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 9Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 10:1–12

1Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ. 5“Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ. 8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’ 10Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị, 11‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’ 12Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike