Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 1 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 18 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Ọktoba 2026
Tọọzdee · Izu nke 18 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Exaltation of the Cross
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya. 6:1Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. 2“Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. 3“Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.” 4Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị. 5Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ. 6Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha. 7Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ. 8Nʼihi na unu maara na Onyenwe anyị ga-akwụghachi onye ọbụla maka ihe ọma ọbụla ha mere, ma ha bụ ohu maọbụ ndị nweere onwe ha. 9Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ.
Oziọma
13Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 14A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa. 15“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara). 16Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu. 17Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya. 18Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya. 19Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ 20Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike. 21Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. 22“Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ. 23Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 24Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara. 25Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị. 26“Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela. 27Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. 28Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Septemba na kalenda nzukọ bụ 1 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike