Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2026 › 2 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Ọktoba 2026

Fraịdee · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 26 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Ndị mmụọ ozi nsọ na-eche nche · Ncheta

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Job 38:1, 12–21; 40:3–4

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: 12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya, 13ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu? 14Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe. 15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri. 16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri? 17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ? 18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile. 19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi? 20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha? 21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ. 40:3Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị: 4“Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 139:1–3, 7–10, 13–14

1Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma 2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. 3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. 7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m? 8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. 9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri, 10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike. 13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. 14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.

Oziọma

Mat 18:1–5, 10

1Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?” 2Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, 3ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. 4Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe. 5Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m. 10“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde A, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike