Bible Explorer

Nyochaa › Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha › Sọl na Devid

Ndị Eze na Ihe E Mere nʼakụkụ ibe ha · Sọl na Devid

Ndịisi ọrụ Devid

2Sa 8:15–18 · 1Ih 18:14–17

2 Samuel

2Sa 8:15–18

15Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.

16Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.

17Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.

18Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.

1 Ihe E Mere

1Ih 18:14–17

14Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.

15Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ.

16Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja. Shavsha bụ ode akwụkwọ eze.

17Benaya nwa Jehoiada bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndịisi nʼọrụ eze.

Akara: okwu akụkọ ọ bụla nwere, na nsụgharị ị na-agụ. A naghị aka akara nʼokwu ndị a na-ahụkarị (“na”, “ọ”); okwu nʼụdị ọzọ nwere ike ọ gaghị enwe akara.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · E ji aka họrọ akụkụ yiri ibe ha site nʼederede ma lelee ha megide ntụaka gafere OpenBible.info (CC BY). Naanị otu ihe mere ma ọ bụ otu okwu e kwuru ka a na-etinye nʼakụkụ ibe ha. OpenBible.info · CC BY