1Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
2Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
3Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram.
4Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn.
5Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.
6Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
7Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa.
8Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
9Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya.
10Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya.
11Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
12Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel.
13Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa.
14Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud.
15Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.