Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 29 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 16 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Disemba 2027
Wenezdee · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Haggai (500 BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
9Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ, 10nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. 11Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m. 12Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs. 13Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ. 14Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị. 15Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru. 16Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. 17Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm. 18Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 19Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs. 20Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike. 21Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile. 22Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ gị. Ka amara dịnyere gị.
Oziọma
30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya. 31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị. 32Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba. 33Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.” 34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Disemba na kalenda nzukọ bụ 29 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike