Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 29 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Disemba 2027
Wenezdee · Oge Krismas
Mmemme na ndị nsọ
29 Disemba — ụbọchị nke ise nʼime ụbọchị asatọ nke Krismas
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Tọmọs Becket, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
3Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile. 4Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya. 5Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya. 6Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya. 7Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya. 8Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta. 9Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a. 10Onye ọbụla na-ahụ nwanna ya nʼanya na-ebi nʼime ihe ahụ ọ dịkwaghị ìhè dị nʼime onye dị otu a bụ nke ga-eme ya ka ọ sụọ ngọngọ. 11Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì.
Abụ Ọma nzaghachi
1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile. 2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. 3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. 5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile. 6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
Oziọma
22Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị 23(dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”), 24ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.” 25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị, 29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. 30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, 31nke i kwadoro nʼihu mba niile. 32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.” 33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Tọmọs Becket, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike