Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 30 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 17 Disemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Disemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Daniel and the Three Holy Youths, Ananias, Azarias, and Misael (c 600 BC)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
5Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu. 6Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike. 7Ebe ọ bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ọ ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. Ọ gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya. 8Ọ ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke. 9Ọ ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu. 10Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta. 11Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa. 12Ọ bụ otu onye nʼime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit niile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nʼazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.” 13Nʼezie, okwu a bụ eziokwu. Nʼihi nke a, baara ha mba nʼolu ike banyere mmehie ha ka ha nwee ike zuo oke nʼokwukwe, 14ka ha kwụsị ige ntị nʼakụkọ ifo ndị Juu na-akọ, maọbụ iwu nke ndị jụrụ ịnabata eziokwu nyere. 15Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ. 16Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla. 2:1Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.
Akwụkwọ ozi (maka Onye amụma Daniel na ụmụ okorobịa atọ ahụ)
33ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm. 34Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ. 35Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma. 36E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ. 37A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ. 38Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu. 39A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. 40Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị. 12:1Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. 2Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
Oziọma
10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara. 11Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” 12Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ? 13Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.” 14Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka. 15Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya. 16Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Disemba na kalenda nzukọ bụ 30 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike