Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 28 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Disemba 2027
Tiuzdee · Oge Krismas
Mmemme na ndị nsọ
Ụmụntakịrị nsọ na-emeghị ihe ọjọọ, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Mmemme · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. 6Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị. 7Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile. 8Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị. 9Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile. 10Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị. 2:1Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ. 2Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile.
Abụ Ọma nzaghachi
2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; 4idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, 5ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. 7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.
Oziọma
13Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.” 14Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt. 15Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.” 16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị. 17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, 18“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ụmụntakịrị nsọ na-emeghị ihe ọjọọ, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike