Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 27 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Disemba 2027
Mọnde · Oge Krismas
Mmemme na ndị nsọ
Onye nsọ Jọn, Onyeozi na Onye dere Oziọma
Mmemme · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. 2Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. 3Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ. 4Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke.
Abụ Ọma nzaghachi
1Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile. 6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi. 12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.
Oziọma
2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn, Onyeozi na Onye dere Oziọma
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike