Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 26 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Disemba 2027

Sọnde · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Ezinaụlọ Nsọ nke Jisọs, Meri na Josef

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Sa 1:20–22, 24–28

20Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.” 21Mgbe di ya, bụ Elkena na ndị ezinaụlọ ya gara Shaịlo ịchụrụ Onyenwe anyị aja nke afọ ahụ, na ịchụkwa aja metụtara nkwa dị iche nke o kwere Onyenwe anyị, 22Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, “Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara, ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.” 24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo. 25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ. 26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị. 27Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya. 28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 84:1–2, 4–5, 8–9

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile! 2Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ. 4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela 5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. 8O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb. 9Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Jọn 3:1–2, 21–24

1Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya. 2Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị. 21Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke 22na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.

Oziọma

Luk 2:41–52

41Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga. 42Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị. 43Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta. 44Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha. 45Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya. 46Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. 47Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya. 48Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?” 49Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?” 50Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha. 51Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya. 52Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike