Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 27 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 14 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Disemba 2027

Mọnde · Izu nke 28 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Thyrsos, Leukios, Callinicos of Apollonia († 249-251)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Tm 2:20–26

20Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla. 21Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ. 22Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta. 23Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu. 24O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya. 25Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu. 26Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.

Oziọma

Mak 8:11–21

11Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya. 12Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.” 13Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. 14Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ. 15Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.” 16Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.” 17Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike? 18Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta? 19Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.” 20“Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.” 21Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Disemba na kalenda nzukọ bụ 27 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike