Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 15 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 2 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Disemba 2027

Wenezdee · Izu nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Prophet Habakuk (7th C BC)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Tm 1:18–20; 2:8–15

18Ugbu a, Timoti nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ. 19Jidesie okwukwe i nwere ike, ya na ezi akọnuche. Nʼihi na ụfọdụ ajụla ezi akọnuche ma si otu a dapụ nʼokwukwe. 20Haimeniọs na Alegzanda so na ndị a. Ewerela m ha nyefee Ekwensu nʼaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesighị ikwu okwu nkwulu megide Chineke. 2:8Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka. 9Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi. 10Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke. 11Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe. 12Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ. 13Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv. 14Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu. 15Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.

Oziọma

Luk 20:1–8

1Otu ụbọchị, ka ọ nọ nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe na-ekwusakwa oziọma. Ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye bịakwutere ya. 2Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?” 3Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m, 4baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?” 5Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 6Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.” 7Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.” 8Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Disemba na kalenda nzukọ bụ 15 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike