Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 17 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 4 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Disemba 2027

Fraịdee · Izu nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Great Martyr Barbara and Martyr Juliana, at Heliopolis in Syria († c. 306)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Tm 4:4–8, 16

4Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya, 5nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ. 6Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro. 7Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke. 8Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu. 16Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.

Akwụkwọ ozi (maka Satọdee)

Gal 3:8–12

8Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 9Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị. 10Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” 11Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 12Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”

Oziọma

Luk 20:19–26

19Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ. 20Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala. 21Ya mere ndị nnyopụta ahụ jụrụ ya sị, “Onye ozizi, anyị mara na i na-ekwu ma na-ezikwa ihe ziri ezi, matakwa na i dịghị ele mmadụ anya nʼihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke dị ka eziokwu si dị. 22O ziri ezi nʼiwu ka anyị tụọ ụtụ isi nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 23Ma ọ matara na nke a bụ ajụjụ aghụghọ, ya mere ọ sịrị ha, 24“Gosinụ m otu mkpụrụ ego denarị. Isi onye ka e sere nʼelu ya, aha onye ka e dekwasịkwara ya?” Ha sịrị, “Ọ bụ nke Siza.” 25Ọ sịrị ha, “Ya mere, nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke Chineke.” 26Ha enweghị ike ijide ya nʼihi ihe o kwuru nʼebe ahụ, nʼihu ọha mmadụ. Ọsịsa ya juru ha anya, ha mechikwara ọnụ.

Oziọma (maka Satọdee)

Luk 12:32–40

32“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ. 33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya. 34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.” 35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu. 36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka. 37Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi. 38Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ. 39Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya. 40Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Disemba na kalenda nzukọ bụ 17 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike