Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 5 Disemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Disemba 2027
Sọnde · Izu nke 2 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 2 nke Advent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 2Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “ Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 6Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
4Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. 5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a. 6Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs. 8Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. 9Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. 10Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. 11Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.
Oziọma
1Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin, 2mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara. 3Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 4Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. 5A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị. 6Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike