Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 5 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 22 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Disemba 2027
Sọnde · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ Ọmụmụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 2
1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
Akwụkwọ ozi
14Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị. 15Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị. 16Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ. 17Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso, 18Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ. 19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.
Oziọma
16Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu. 17O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’ 18“Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ. 19Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’ 20“Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’ 21“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Novemba na kalenda nzukọ bụ 5 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike