Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 2 Disemba

Kalenda Ọtọdọks · 19 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Disemba 2027

Tọọzdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Prophet Obadiah (9th C BC)

Obubu ọnụ Ọmụmụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 5:1–8

1Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ. 2Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. 3Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ. 4Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi. 5Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị. 6Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị. 7Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. 8Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.

Oziọma

Luk 16:1–9

1Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi. 2Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’ 3“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ. 4Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’ 5“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’ 6“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’ 7“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’ 8“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè. 9Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Novemba na kalenda nzukọ bụ 2 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike