Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2027 › 1 Disemba
Kalenda Ọtọdọks · 18 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Disemba 2027
Wenezdee · Izu nke 24 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Platon of Ancyra († 302 or 306)
Obubu ọnụ Ọmụmụ
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa. 2Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu. 3Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko, 4ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. 5Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke. 6Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike. 7Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ. 8Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya. 9Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ. 10Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a. 11Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu, 12nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.
Oziọma
1Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu. 2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.” 3Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, 4“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya? 5Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya. 6Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’ 7Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa. 8“Maọbụ olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ nʼotu nʼime ha adafuo. Ọ gaghị amụnye oriọna, zaa ime ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutu ọ chọta ya? 9Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’ 10Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Novemba na kalenda nzukọ bụ 1 Disemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike