Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 27 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Novemba 2027
Satọdee · Izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 34 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15“Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji. 16Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara. “Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara. 17‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa. 18Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’ 19“Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ. 20Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ. 21Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa. 22Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ. 23“Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile. 24Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi. 25Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara. 26“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam. 27Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’
Abụ Ọma nzaghachi
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma
34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. 35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. 36Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike