Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 29 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Novemba 2027
Mọnde · Izu nke 1 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 1 nke Advent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. 2Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta. 4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. 4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. 5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid. 6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo. 7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.” 8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.” 9Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.
Oziọma
5Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. 6Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.” 7Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?” 8Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. 9Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.” 10Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile. 11Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike